10Ma onyeozi a gwara Daniel, “Ana m atụ egwu nʼihi onyenwe m eze, onye kwuru ihe unu ga-eri na ihe unu ga-aṅụ. Ọ bụrụ na ọ hụ na unu tara ahụ karịa ndị ọgbọ unu ndị ọzọ, ndụ m ga-anọ na nsogbu nʼaka onye eze.”
11Daniel sịrị onyeisi ahụ e tinyere ọrụ ilekọta Daniel, na Hananaya, na Mishael, na Azaraya nʼaka,
12“Biko, nye anyị naanị ahịhịa nri, na mmiri ọṅụṅụ, ka ọ bụrụ ihe oriri anyị na ihe ọṅụṅụ anyị. Jiri ya lee anyị ule ụbọchị iri.
13Jirizie anya gị chọpụta ma o nwere ihe dị iche nʼetiti anyị na ndị ọzọ, ndị na-eri nri ọma nke eze nyere, site nʼihe ị hụrụ, mee ụmụodibo gị otu o kwesiri.”
14O kwenyere ime ihe ha kwuru, ọ nwalere ha abalị iri.