14O kwenyere ime ihe ha kwuru, ọ nwalere ha abalị iri.
15Mgbe ụbọchị iri ahụ zuru, a chọpụtara na ahụ dị ha mma, chọpụtakwa na ha dị mma ile anya karịa ụmụ okorobịa ndị ọzọ e ji nri ọma niile eze nyere zụọ.
16Ya mere onyeisi ozi ahụ wepụrụ nri na mmanya ọma ahụ ha kwesiri iri ma nye ha naanị akwụkwọ nri.
17Chineke mere ka ụmụ okorobịa anọ ndị a nwee ọgụgụisi pụrụ iche na nghọta nʼihe ọbụla gbasara edemede na amamihe niile. Daniel nwekwara nghọta ịkọwa ụdị ọhụ niile na nrọ niile.
18Mgbe oge eze nyere a ga-eji kpọbata ha nʼije ozi ya zuru, onyeisi ndị na-eje ozi chere ha nʼihu Nebukadneza.