12Ma mgbe o merichara ndị agha ahụ, ọ ga-enwe ọṅụ dị ukwu, ọ ga-egbukwa imerime puku ndị mmadụ, ma ọ gaghị emeri na-aga nʼihu.
13Mgbe afọ ole na ole gafere, eze ndị mpaghara ugwu ga-eduru ndị agha ji ezi ngwa agha, na ndị bara ụba nʼọnụọgụgụ karịa ndị nke e meriri nʼagha na mbụ pụọ ibu agha.
14“Nʼoge ahụ, ọtụtụ ndị ga-ebili imegide eze ndịda, Ụfọdụ ndị ọkpa aghara nʼetiti unu ga-enupukwa isi, ha ga-esi otu a mezuo ihe a ị hụrụ nʼọhụ, ma a ga-emeri ha.
15Mgbe ahụ, eze ndị mpaghara ugwu ga-abịa buo agha megide obodo ndị ndịda e wusiri ike, lụgbukwaa ya. Ndị agha agaghị enwe ike iguzogide ha ọ bụladị ndị ha bụ ọka ibe nʼagha.
16Ma onye nke na-ebuso ya agha ga-eme ihe masịrị ya, ma o nweghị onye ga-egbochi ha. Ọ ga-abatakwa nʼAla Ọma ahụ, ebe ihe niile ga-anọ nʼokpuru ya.