Daniel 12

“Ma gị onwe, gawara onwe gị ruo ọgwụgwụ ihe ndị a. Ị ga-ezukwa ike, ị ga-ebilitekwa nʼoge ikpeazụ ịnara ihe nketa nke ruuru gị.”

Daniel 12:13 (UKJV) But go you your way till the end be: for you shall rest, and stand in your lot at the end of the days.

11“Site nʼoge e mechiri ịchụ aja nsure ọkụ nke a na-achụ kwa ụbọchị niile ruo nʼoge a ga-ewuli ihe arụ ahụ nke na-eweta mbibi, ga-abụ otu puku ụbọchị, na narị ụbọchị abụọ na iri ụbọchị itoolu. (1,290)

12Ngọzị ga-adịrị onye ahụ nke na-echere, ma nọgidesịkwa ike ruo mgbe otu puku ụbọchị, na narị ụbọchị atọ, na iri ụbọchị atọ na ise (1,335) ahụ gafere.

13“Ma gị onwe, gawara onwe gị ruo ọgwụgwụ ihe ndị a. Ị ga-ezukwa ike, ị ga-ebilitekwa nʼoge ikpeazụ ịnara ihe nketa nke ruuru gị.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.