Daniel 12

Igwe ndị niile nwụrụ anwụ, ndị e likwara, ha ga-ebilite. Ụfọdụ ha ga-ebili baa na ndụ ebighị ebi, ma ụfọdụ ga-ebili keta ihere na ịbụ ọnụ nke ebighị ebi.

Daniel 12:2 (UKJV) And many of them that sleep in the dust of the earth shall awake, some to everlasting life, and some to shame and everlasting contempt.

1“Nʼoge ahụ, Maikel, onyeisi ọchịchị ukwuu ahụ, nke na-eche ndị unu, ga-ebili. Ọ ga-abụ oge nhụju anya, a na-ahụtụbeghị ụdị ya site na mgbe mba ọbụla malitere ruo ugbu a. Ma mgbe ahụ, ndị gị niile, ndị e dere aha ha nʼakwụkwọ ahụ, ka a ga-anapụta.

2Igwe ndị niile nwụrụ anwụ, ndị e likwara, ha ga-ebilite. Ụfọdụ ha ga-ebili baa na ndụ ebighị ebi, ma ụfọdụ ga-ebili keta ihere na ịbụ ọnụ nke ebighị ebi.

3Ndị ahụ bụ ndị maara ihe, ka a ga-eme ka ha nwuo ọcha dịka ihe mbara eluigwe. Ndị ahụ niile na-emekwa ka ọtụtụ si nʼihe ọjọọ mee ezi omume ga-enwukwa dịka kpakpando ruo mgbe ebighị ebi.

4Ma gị bụ Daniel, zoo okwu e dere nʼakwụkwọ a, mechiekwa ma kachiekwa ha akara tutu ruo ọgwụgwụ oge. Ọtụtụ ga-agbagharị ebe na ebe ọzọ, ma ihe ọmụma ga-aba ụba.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.