6Otu nʼime ha juru nwoke ahụ yi uwe akwa ọcha, nke guzo nʼakụkụ elu elu nke osimiri ahụ ajụjụ, sị, “Olee mgbe ihe ndị a na-eyi egwu ga-emezu?”
7Nwoke ahụ yi uwe akwa ọcha, nke nọ nʼakụkụ elu elu mmiri nke osimiri ahụ chịlịri aka nri na aka ekpe ya elu. Anụkwara m mgbe o ji Onye ahụ na-adị ndụ ruo mgbe niile ebighị ebi ṅụọ iyi, “Nʼihe ndị a ga-emezu naanị mgbe afọ atọ na ọkara gafere, tupu onye ahụ na-emebi ike nke ndị dị nsọ ga-abịa nʼisi ngwụcha ndụ ya, ihe ndị a niile ga-emezucha.”
8Anụrụ m ma aghọtaghị m, nʼihi nke a, a sịrị m, “Biko, Onyenwe m, gịnị ka ihe ndị a ga-apụta?”
9Ọ sịrị, “Daniel, gawara onwe gị. Nʼihi na-apịachiela okwu ndị a, kachiekwa ya akara tutu ruo nʼọgwụgwụ oge.
10Ọtụtụ ka a ga-eme ka ha dị ọcha, sachaa ha mee ka ha dị ọcha na-enweghị ntụpọ, a ga-anụchakwa ha. Ma ndị ajọ omume ga-aga nʼihu nʼajọ omume ha. O nweghị onye ajọ omume nke ga-aghọtakwa ihe, ma ndị ahụ maara ihe ga-aghọta ihe ihe a pụtara.