1Nʼime afọ nke abụọ nke ọchịchị ya, eze Nebukadneza rọrọ nrọ dị iche iche. Nrọ ndị a mere ka obi ya gbasasịa, ụra pụkwara ya nʼanya.
2Mgbe ahụ, eze kpọrọ ndị majiki, ndị ha na mmụọ ọjọọ na-ekwu okwu, ndị mgbaasị na ndị ihe banyere ngagharị nke kpakpando doro anya ka ha bịa gwa ya ihe ahụ ọ rọrọ na nrọ. Mgbe ha bịara, guzo nʼihu eze,
3ọ sịrị ha, “Arọrọ m nrọ nke na-enye m nsogbu nʼobi. Achọrọ m ịma ihe ọ pụtara.”