9Ọ bụrụ na unu agwaghị m nrọ ahụ naanị otu ntaramahụhụ dịịrị unu. Unu agbaala izu ịgwa m okwu ụgha na okwu nduhie na-ele anya na ọnọdụ ga-agbanwe. Ya mere, gwanụ m nrọ ahụ, m ga-amatakwa na unu pụrụ ịkọwara m ya.”
10Ndị Kaldịa zara eze, “Ọ dịghị mmadụ ọbụla nʼelu ụwa a nke nwere ike ime ihe a eze na-achọ. Ọ dịghịkwa eze, nʼagbanyeghị ịdị ukwuu ya na ịdị ike ya, nke jụtụrụla ụdị ihe dị otu a eze na-ajụ nʼaka ndị mgbaasị, ndị na-agba aja ya, ndị ha na mmụọ ọjọọ na-ekwu okwu, na ndị Kaldịa.
11Ihe a ị chọrọ ka anyị mee bụ ihe na-agaghị ekwe omume. Ọ bụ naanị ndị mmụọ nwere ike ịkọrọ gị ihe ị rọrọ na nrọ. Ndị mmụọ anọkwaghị nʼetiti ndị mmadụ.”
12Nke a mere ka eze jupụta nʼoke iwe na ọnụma, o nyere iwu ka e gbuchaa ndị amamihe niile nke Babilọn.
13Mgbe e kwupụtara iwu onye eze ka e gbuo ndị oke amamihe niile, ndị agha chọkwara ebe Daniel na ndị otu ya nọ ka ha gbuo ha.