14Mgbe Ariok, onye bụ onyeisi ndị nche eze pụrụ igbu ndị ikom maara ihe na Babilọn, Daniel ji amamihe na ezi uche gwa ya okwu.
15Ọ jụrụ onyeozi eze, bụ Ariok, “Gịnị mere eze ji nye iwu dị ike dị otu a?” Mgbe ahụ, Ariok kọwaara ihe niile nye Daniel.
16Mgbe ahụ, Daniel banyere nʼụlọeze, ịhụ ya. Ọ rịọrọ eze ka o nyetụ ya nwa oge iji kọwaakwara ya ihe nrọ ahụ pụtara.
17Emesịa, Daniel lara nʼụlọ nke ya gaa kọọrọ Hananaya, na Mishael, na Azaraya, ndị enyi ya ihe merenụ.
18Ọ gwara ha ka ha rịọọ maka ebere site nʼaka Chineke nke eluigwe banyere ihe nzuzo a, ka a hapụ igbu ya na ndị enyi ya na ndị amamihe fọdụrụ na Babilọn.