31“Eze, ihe ị hụrụ nʼọhụ bụ nke a. Ị hụrụ mmadụ a kpụrụ akpụ. Mmadụ a a kpụrụ akpụ buru nnọọ ibu. Ọ na-egbukwa nweghenweghe, bụrụkwa ihe na-eyi onye ọbụla lekwasịrị ya anya egwu.
32E ji ọlaedo a nụchara anụcha kpụọ isi mmadụ ahụ, jiri ọlaọcha kpụọ aka ya na obi ya. E jikwa bronz kpụọ afọ ya na apata ụkwụ ya.
33Ọ bụkwa igwe ka e ji kpụọ ogwe ụkwụ ya abụọ. Ma akụkụ ụkwụ ya, nke a na-azọ nʼala ka e ji igwe a gwara ya na ụrọ kpụọ.
34Mgbe ị na-ele anya, a wapụtara nkume, ma ọ bụghị aka mmadụ ka e ji wapụta ya. Nkume a kụrụ mmadụ ahụ a kpụrụ akpụ nʼukwu nkume na ụrọ ya, kụpịasịa ha.
35Mgbe ahụ, e tijisịrị igwe ahụ na ụrọ ahụ, bronz ahụ na ọlaọcha ahụ nakwa ọlaedo ahụ niile. Ha dịka igbugbo ọka nke na-adị nʼebe a na-azọcha ọka nʼoge okpomọkụ. Ifufe fechapụsịrị ha na-ahapụghị ihe ngosi ọbụla. Ma nkume ahụ dakwasịrị ihe ahụ awuru awu mechara ghọọ ugwu dị ukwuu, nke jupụtara ụwa niile.