37Gị onwe gị, eze, bụ eze nke ọtụtụ ndị eze ọzọ nọ nʼokpuru ya, onye Chineke nke eluigwe nyere ike ọchịchị, nʼocheeze niile, na ike na otuto;
38nyefeekwa nʼaka gị ụmụ mmadụ niile na ụmụ anụmanụ bi nʼime ọhịa, na ụmụ nnụnụ nke igwe, e mere ka ị bụrụ eze ihe niile ndị a, gị bụ isi ahụ e ji ọlaedo kpụọ.
39“Mgbe ị chịchara alaeze ọzọ ga-ebili, ma ọ gaghị adị ukwuu dịka nke gị, mgbe nke a gasịrị, alaeze ọzọ bụ nke atọ, nke ga-adị ka bronz ga-ebilikwa, ọ ga-achị ụwa niile.
40A ga-enwekwa alaeze nke anọ, nke ga-esi ike dịka igwe. Dịka igwe nke na-akụri ihe niile, ọ ga-egwepịa ma kụrikwaa ndị a niile.
41Ma ebe ị hụrụ na ọbụ ụkwụ ahụ na mkpịsịụkwụ ya niile na ụfọdụ nʼime ha bụ ụrọ ọkpụ ite na ụfọdụ bụkwa igwe, alaeze nke ekewara ekewa ka ọ ga-abụ, ma ọ ga-esitụ ike dịka igwe nke dị nʼime ya, nʼihi na ị hụrụ igwe ahụ na agwakọtara ya na ụrọ apịtị.