Daniel 3

Ha gwara eze, bụ Nebukadneza, “Ka eze dị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.

Daniel 3:9 (UKJV) They spoke and said to the king Nebuchadnezzar, O king, live for ever.

7Ya mere, ngwangwa ha nụrụ ụda opi ike, nke ọja, une ụbọ akwara, nke une na nke egwu dị iche iche, ndị niile si mba dị iche iche, ndị na-asụ asụsụ dị iche iche, dara nʼala kpọọ isiala nye oyiyi ọlaedo ahụ, nke eze bụ Nebukadneza guzobere.

8Nʼoge a, ụfọdụ nʼime ndị Kaldịa pụtara nʼihu boo ndị Juu ebubo.

9Ha gwara eze, bụ Nebukadneza, “Ka eze dị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.

10Gị, onwe gị nyere iwu, na onye ọbụla nụrụ ụda opi ike, ọja, une, ụbọ akwara maọbụ ihe egwu ọzọ ga-akpọ isiala sekpuoro ihe ahụ e ji ọlaedo kpụọ,

11na onye ọbụla jụrụ ịkpọ isiala ka a ga-atụba nʼime ọkụ na-enwu ajọ onwunwu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.