Daniel 4

“Mgbe ahụ, ị hụkwara onye dị nsọ na-enyocha omume ndị mmadụ nke si nʼeluigwe rịdata na-asị, ‘Gbutuonụ osisi a, laa ya nʼiyi, ma unu hapụ ogwe ya ka ahịhịa ndụ gbaa ya gburugburu, ka e jirikwa ụdọ igwe na bronz kee ya gburugburu; hapụ ya ka igirigi nke eluigwe zokwasị ya. Hapụkwa ya ka o soro anụ ọhịa taa ahịhịa dịka nri ya tutu afọ asaa a gafee.’

Daniel 4:23 (UKJV) And whereas the king saw a watcher and an holy one coming down from heaven, and saying, Hew the tree down, and destroy it; yet leave the stump of the roots thereof in the earth, even with a band of iron and brass, in the tender grass of the field; and let it be wet with the dew of heaven, and let his portion be with the beasts of the field, till seven times pass over him;

21nke nwekwara akwụkwọ ndụ dị mma, na nke jupụtara na mkpụrụ, nke na-egboro mmadụ niile mkpa nri, nke ụmụ anụmanụ ọhịa niile na-ebi nʼokpuru ndo ya, nke ụmụ nnụnụ niile nke eluigwe nwere akwụ ebe obibi ha,

22osisi ahụ bụ gị onwe gị, eze. Nʼihi na i toola bụrụ onye dị ike na onye dị ukwuu. Ịdị ukwu gị eruola nʼeluigwe. Ọchịchị gị eruokwala nʼakụkụ niile nke ụwa.

23“Mgbe ahụ, ị hụkwara onye dị nsọ na-enyocha omume ndị mmadụ nke si nʼeluigwe rịdata na-asị, ‘Gbutuonụ osisi a, laa ya nʼiyi, ma unu hapụ ogwe ya ka ahịhịa ndụ gbaa ya gburugburu, ka e jirikwa ụdọ igwe na bronz kee ya gburugburu; hapụ ya ka igirigi nke eluigwe zokwasị ya. Hapụkwa ya ka o soro anụ ọhịa taa ahịhịa dịka nri ya tutu afọ asaa a gafee.’

24“Eze, nke a bụ nkọwa nrọ ị rọrọ, Onye kachasị ihe niile elu enyela iwu nke na-aghaghị imezu megide onyenwe m eze.

25A ga-achụpụ gị site nʼebe ndị mmadụ nọ. A ga-achụgakwa gị nʼebe gị na ụmụ anụmanụ ga-ebi nʼọhịa, Ebe ahụ ka ị ga-anọ taa ahịhịa dịka oke ehi, igirigi nke eluigwe ga-ezokwasịkwa gị. Ọnụọgụgụ afọ asaa ga-agabiga tutu ruo mgbe ị nabatara na Onye kachasị ihe niile elu na-achị achị nʼalaeze niile nke mmadụ, na ọ bụkwa nʼaka onye ọbụla ọ chọrọ ka ọ na-enyefe ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.