1Eze Belshaza, kpọrọ puku ndịisi nọ nʼalaeze ya oriri, ebe ha nọ ṅụọ nnọọ mmanya dị ukwuu.
2Mgbe Belshaza na-aṅụ mmanya ya, ọ nyere iwu ka a chịtara ya iko ọlaedo na ọlaọcha nke nna ya bụ Nebukadneza si nʼụlọnsọ ukwu dị na Jerusalem chịkọta, ka eze na ndị a mara aha ha nʼalaeze ya, na ndị nwunye ya, na ndị iko ya jiri ha ṅụọ mmanya.
3Ya mere, a chịtara iko ọlaedo ndị e si nʼụlọnsọ ukwu Chineke dị na Jerusalem chịkọta. Eze na ndị a mara aha ha nʼalaeze ya na ndị nwunye ya na ndị iko ya jiri ha ṅụọ mmanya.