Daniel 5

Ha ṅụrụ mmanya tookwa chi nke ọlaedo na ọlaọcha na bronz, na igwe na osisi na nkume.

Daniel 5:4 (UKJV) They drank wine, and praised the gods of gold, and of silver, of brass, of iron, of wood, and of stone.

2Mgbe Belshaza na-aṅụ mmanya ya, ọ nyere iwu ka a chịtara ya iko ọlaedo na ọlaọcha nke nna ya bụ Nebukadneza si nʼụlọnsọ ukwu dị na Jerusalem chịkọta, ka eze na ndị a mara aha ha nʼalaeze ya, na ndị nwunye ya, na ndị iko ya jiri ha ṅụọ mmanya.

3Ya mere, a chịtara iko ọlaedo ndị e si nʼụlọnsọ ukwu Chineke dị na Jerusalem chịkọta. Eze na ndị a mara aha ha nʼalaeze ya na ndị nwunye ya na ndị iko ya jiri ha ṅụọ mmanya.

4Ha ṅụrụ mmanya tookwa chi nke ọlaedo na ọlaọcha na bronz, na igwe na osisi na nkume.

5Na mberede, ha hụrụ mkpịsịaka mmadụ ka ọ na-ede ihe nʼaja ụlọ nke ụlọeze ahụ ha nọ nʼime ya, na ncherita ihu ebe a dọbara iheọkụ. Eze nʼonwe ya hụrụ aka ahụ mgbe ọ na-ede ihe ahụ.

6Mgbe ahụ, ihu eze ahụ tụhịkọtara, gbarụọ nʼihi egwu. Oke ụjọ tụrụ ya. Ụkwụ ya makwara jijiji. Ikpere ya abụọ kụkọtara onwe ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.