Daniel 6

Nʼikpeazụ, eze nyere iwu, ha kpụpụtara Daniel tụba ya nʼolulu ọdụm. Eze gwara Daniel, “Ka Chineke gị, onye ahụ ị na-efe mgbe niile, zọpụta gị.”

Daniel 6:16 (UKJV) Then the king commanded, and they brought Daniel, and cast him into the den of lions. Now the king spoke and said unto Daniel, Your God whom you serve continually, he will deliver you.

14Obi jọrọ eze njọ nke ukwuu mgbe ọ nụrụ ihe ndị a. O kpebiri nʼobi ya ime ihe niile ịhụ na Daniel ataghị ahụhụ. Ya mere, ụbọchị ahụ niile, site nʼụtụtụ ruo nʼanyasị, ọ nọ na-eche otu ọ ga-esi mee nke a.

15Mgbe ahụ, ndị ikom ndị a bịakwutere eze sị ya, “Chetakwa, gị eze, na dịka iwu ndị Midia na Peshịa si dị, ọ dịghị iwu ọbụla eze nyere maọbụ ụkpụrụ nke e mere ka o guzosie ike ga-agbanwe.”

16Nʼikpeazụ, eze nyere iwu, ha kpụpụtara Daniel tụba ya nʼolulu ọdụm. Eze gwara Daniel, “Ka Chineke gị, onye ahụ ị na-efe mgbe niile, zọpụta gị.”

17E wetara nkume dị ukwuu jiri mechie ọnụ olulu ọdụm ahụ. Eze jikwa mgbaaka akara ya na mgbaaka ndịisi ọzọ kaa akara e ji nyachie ọnụ olulu ahụ. E mere nke a ka ọnọdụ Daniel hapụ ịgbanwe.

18Mgbe eze lọbatara nʼụlọeze ya, o dinara nʼihe ndina ya buo ọnụ, onweghịkwa nri ebutere ya. Nʼabalị ahụ, o nweghị ike rahụ ụra.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.