Daniel 7

Nʼafọ mbụ, mgbe Belshaza bidoro ịchị ala Babilọn, Daniel rọrọ nrọ, hụkwa ọhụ dị iche iche, o dere ihe ndị ahụ nʼakwụkwọ.

Daniel 7:1 (UKJV) In the first year of Belshazzar king of Babylon Daniel had a dream and visions of his head upon his bed: then he wrote the dream, and told the sum of the matters.

1Nʼafọ mbụ, mgbe Belshaza bidoro ịchị ala Babilọn, Daniel rọrọ nrọ, hụkwa ọhụ dị iche iche, o dere ihe ndị ahụ nʼakwụkwọ.

2“Mụ bụ Daniel hụrụ nʼime ọhụ m nʼabalị, elere m anya, hụ nʼihu m oke ifufe anọ nke eluigwe ka ha na-atụgharị oke osimiri.

3Anụ ọhịa anọ buru ibu si nʼime osimiri ahụ rịpụta. O nweghị nke yiri ibe ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.