15“Mụ onwe m, bụ Daniel, ọhụ a m hụrụ tụrụ mmụọ m ụjọ nke ukwuu, mekwa ka obi m ma jijiji.
16Ejekwuuru m otu nʼime ndị guzo nʼebe ahụ nso jụọ ya ihe ihe ndị a niile pụtara. “Ọ gwara m ma kọwakwara m ihe ihe ndị a pụtara.
17‘Anụ ọhịa anọ ndị a bụ alaeze anọ nke ga-ebili nʼụwa.
18Ma ọ bụ ndị nsọ nke Onye kachasị ihe niile elu, ga-anara alaeze. Ọ ga-abụkwa nke ha ruo mgbe ebighị ebi.’
19“Mgbe ahụ, achọrọ m ịmata ihe banyere anụ ọhịa nke anọ ahụ, nke ahụ gbara iche site nʼanụ ọhịa ndị ọzọ, na-eyikwa oke egwu, nke nwere eze dịka igwe, na mbọ yiri nke e ji bronz kpụọ. Nke ahụ na-adọwasị ndị mmadụ, na nke na-azọgbukwa ndị fọdụrụ.