Daniel 7

“ ‘Ma a ga-emeghe ụlọ ikpe, napụkwa ya ike niile, kpochapụ ya ma laakwa ya nʼiyi kpamkpam.

Daniel 7:26 (UKJV) But the judgment shall sit, and they shall take away his dominion, to consume and to destroy it unto the end.

24Mpi iri ahụ nọchiri anya ndị eze iri ga-esi nʼalaeze ya pụta. Mgbe ndị eze a ga na-achị, eze ọzọ, nke dị iche site na ndị bụrụ ya ụzọ ga-ebilikwa, ma merie ndị eze atọ ndị ọzọ ahụ ma laa ha nʼiyi.

25Ọ ga-ekwu okwu kwugide Onye kachasị ihe niile elu. O ga-emekpa ndị nsọ ahụ. Ọ ga-agbalịkwa ịgbanwe iwu niile na omenaala niile. A ga-enyefe ndị nsọ nʼaka ya afọ atọ na ọkara.

26“ ‘Ma a ga-emeghe ụlọ ikpe, napụkwa ya ike niile, kpochapụ ya ma laakwa ya nʼiyi kpamkpam.

27Mgbe ahụ, ike ọchịchị, ike na ịdị ukwuu nke alaeze niile dị nʼokpuru eluigwe ka a ga-enyefe nʼaka ndị nsọ, bụ ndị nke Onye ahụ kachasị ihe niile elu. Alaeze ya ga-adịgidekwa ruo mgbe ebighị ebi. Ndị niile na-achị achị ga-erubere ya isi, kpọọkwa isiala nye ya.’

28“Nke a bụ ọgwụgwụ okwu ahụ. Mụ onwe m, bụ Daniel, echiche m mere ka m tụọ egwu nke ukwu, ihu m gbanwere dịka onye ahụ na-adịghị, ma o nweghị onye ọbụla m gwara ihe m hụrụ.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.