9Otu ntakịrị mpi sitere nʼime otu nʼime mpi ndị ahụ pụta, tokwaa ma buo ibu nke ukwuu ruo na ndịda, na ọwụwa anyanwụ, ruokwa nʼala ọma ahụ
10O toro tutu o ruo usuu nke eluigwe. Ọ kwatukwara ụfọdụ nʼime usuu nke eluigwe na ụfọdụ nʼime kpakpando nʼala, zọtọọ ha.
11O mere onwe ya ka ọ dị ukwuu megide onyeisi nke usuu eluigwe, ọ napụrụ ya aja niile a na-achụ kwa ụbọchị ma tụdakwa ebe nsọ ya nʼala.
12Nʼihi nnupu isi, e nyefere usuu ndị nsọ na aja nsure ọkụ a na-esure kwa ụbọchị nʼaka ya. Ọ gara nʼihu nʼihe niile o mere. E mekwara ka eziokwu daa nʼala.
13Mgbe ahụ, anụrụ m ka otu mmụọ ozi na-ajụ ibe ya sị, “Olee mgbe ọ ga-akwụsị bụ ọhụ maka aja nsure ọkụ a na-achụ kwa ụbọchị, njehie nke na-eweta ịtọgbọ nʼefu, inyefe ebe nsọ na maka ndị nsọ a na-azọtọ ụkwụ?”