12Nʼihi nnupu isi, e nyefere usuu ndị nsọ na aja nsure ọkụ a na-esure kwa ụbọchị nʼaka ya. Ọ gara nʼihu nʼihe niile o mere. E mekwara ka eziokwu daa nʼala.
13Mgbe ahụ, anụrụ m ka otu mmụọ ozi na-ajụ ibe ya sị, “Olee mgbe ọ ga-akwụsị bụ ọhụ maka aja nsure ọkụ a na-achụ kwa ụbọchị, njehie nke na-eweta ịtọgbọ nʼefu, inyefe ebe nsọ na maka ndị nsọ a na-azọtọ ụkwụ?”
14Ọ gwara m, “A ga-echere tutu puku ụbọchị abụọ na narị ụbọchị atọ agafee, mgbe ahụ a ga-eme ka ebe nsọ ahụ dịghachikwa otu ọ dị na mbụ.”
15Mgbe mụ bụ Daniel nọ na-ele ọhụ ahụ na-achọkwa ịghọta ya, o nwere otu onye dịka nwoke bịara guzo nʼihu m.
16Ma anụrụ m olu otu onye na-akpọ oku site na mmiri Ulai sị, “Gebrel, kọwaara nwoke a ihe ọhụ a pụtara.”