5Mgbe m nọ na-atule nke a, na mberede ahụrụ m otu mkpi si nʼọdịda anyanwụ pụta, na-agafe ụwa niile ma ụkwụ erughị ya ala. Mkpi a, nwere otu mpi nʼetiti anya abụọ ya.
6Ọ bịaruru nso ebule ahụ nwere mpi abụọ nke m hụrụ guzo nʼakụkụ mmiri, were oke iwe na-agbata ọsọ nʼebe ọ nọ.
7Ahụrụ m ka o ji oke iwe lụso ebule ahụ ọgụ kujipụ mpi abụọ ya. Ebule ahụ enweghị ike iguzogide ya. Ọ tụdara ya nʼala, were ụkwụ ya zọda ya, ma na o nweghị onye ọbụla nwere ike ịnapụta ebule ahụ site nʼike ya.
8Mkpi ahụ, dịịrị ike nke ukwu, ma nʼuju ike ya a gbajipụrụ mpi ukwu ya. Nʼọnọdụ mpi ahụ mpi anọ puputara chee ihu nʼakụkụ anọ nke eluigwe,
9Otu ntakịrị mpi sitere nʼime otu nʼime mpi ndị ahụ pụta, tokwaa ma buo ibu nke ukwuu ruo na ndịda, na ọwụwa anyanwụ, ruokwa nʼala ọma ahụ