25“Ma mara, werekwa uche ghọta nke a: Site nʼoge e nyere iwu ka e wugharịa Jerusalem tutu ruo mgbe Onye ahụ e tere mmanụ, onyendu ahụ ga-abịa, ga-abụ izu ụka asaa, na izu ụka iri isii na abụọ, a ga-ewughachi ya, na okporoụzọ ya, na olulu mmiri ya, maọbụ nʼime oge nsogbu.
26Mgbe izu ụka iri isii na abụọ gasịrị, Onye ahụ e tere mmanụ ka a ga-egbu, ma o nweghị ihe ọ ga-enwe. Usuu agha nke onye ọchịchị ga-abịa bibie obodo na ụlọnsọ. Oge ikpeazụ ga-abịa dịka idee mmiri; agha ga-adịgide ruo nʼoge ọgwụgwụ, e kpebiela na ịla nʼiyi ga-adị.
27Ya na ọtụtụ ndị mmadụ ga-enwe ọgbụgba ndụ nʼotu ‘izu ụka,’ ọ bụkwa nʼọkara izu ụka ahụ, ka ọ ga-eme ka ịchụ aja na inye onyinye kwụsị. Ọ ga-emekwa ihe arụ dị egwu nʼime ụlọnsọ ahụ, ruo mgbe a ga-awụkwasị ya ọgwụgwụ ahụ bụ nke akara aka nʼahụ onye ọjọọ ahụ.”