22Rie ha dịka ị ga-esi rie ele maọbụ mgbada. Onye ọbụla nʼime unu nwere ike rie ya, ma onye dị ọcha ma onye na-adịghị ọcha.
23Ma lezie anya hụ na i righị ọbara, nʼihi na ndụ dị nʼọbara. Ị gaghị erikọta anụ ọbụla na ndụ ya.
24Erila ọbara, wụsa ya nʼala dịka mmiri.
25Erila ya, ka ihe si otu a gaara gị na ụmụ ụmụ gị nke ọma, nʼihi na ị na-eme ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị.
26Ma were ihe ndị ahụ niile i doro nsọ, ya na ihe ọbụla i kwere Onyenwe anyị na nkwa gaa nʼebe ahụ Onyenwe anyị ga-ahọpụta.