10Jiri nkume tugbuo ya, nʼihi na ọ chọrọ ime ka i site nʼiso Onyenwe anyị Chineke, wezuga onwe gị, ka ị pụọ, ma chigharịa site nʼiso ya, bụ Onyenwe anyị, onye mere ka i site nʼala Ijipt pụta, ala ebe ị nọ nʼime ya dịka ohu.
11Izrel niile ga-anụkwa banyere ihe ọjọọ o mere, ha ga-atụkwa ihe ọjọọ dị otu a egwu, ọ dịkwaghị onye ọbụla nʼetiti gị ga-achọkwa ime ihe ọjọọ dị otu ahụ.
12Mgbe i bi nʼobodo ndị ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị, ọ bụrụ na akụkọ esite nʼotu obodo ndị a ruo gị ntị sị,
13na ụfọdụ ndị mmadụ jọgburu onwe ha eduhiela ndị obodo ha, na-asị, “Ka anyị gaa fee chi ndị ọzọ ofufe” (bụ chi ndị ị na-amaghị na mbụ),
14tupu i mee ihe ọbụla, ị ga-eburu ụzọ jụọ ase, jụpụta nke ọma, ma nyochapụta ma okwu ahụ ọ bụ eziokwu. Ọ bụrụ na ọ bụ eziokwu na-achọpụtakwara nʼihe arụ dị otu a mere nʼetiti unu,