Diuteronomi 13

Ihe nkwata niile i si nʼobodo ahụ kwata ka ị ga-ekpokọta nʼotu ebe, nʼama dị nʼetiti obodo ahụ. A ga-akpọkwa ha niile ọkụ, gbaakwa obodo ahụ niile ọkụ, dịka aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị bụ Chineke unu. Ruo mgbe ebighị ebi, obodo ahụ ga-abụ mkpọmkpọ ebe, a gaghị ewugharịkwa ya ọzọ.

Deuteronomy 13:16 (UKJV) And you shall gather all the spoil of it into the midst of the street thereof, and shall burn with fire the city, and all the spoil thereof everything, for the LORD your God: and it shall be an heap for ever; it shall not be built again.

14tupu i mee ihe ọbụla, ị ga-eburu ụzọ jụọ ase, jụpụta nke ọma, ma nyochapụta ma okwu ahụ ọ bụ eziokwu. Ọ bụrụ na ọ bụ eziokwu na-achọpụtakwara nʼihe arụ dị otu a mere nʼetiti unu,

15ị ghaghị ibuso obodo ahụ agha jiri mma agha gbuo ndị mmadụ niile bi nʼime obodo ahụ. Ị ghaghị ibibi ya kpamkpam, ma ndị mmadụ ma anụ ụlọ ha.

16Ihe nkwata niile i si nʼobodo ahụ kwata ka ị ga-ekpokọta nʼotu ebe, nʼama dị nʼetiti obodo ahụ. A ga-akpọkwa ha niile ọkụ, gbaakwa obodo ahụ niile ọkụ, dịka aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị bụ Chineke unu. Ruo mgbe ebighị ebi, obodo ahụ ga-abụ mkpọmkpọ ebe, a gaghị ewugharịkwa ya ọzọ.

17Ọ dịghị ihe ndị ahụ e debere nye mbibi nke e kwesiri ịhụ nʼaka gị. Nke a ga-emekwa ka iwe ọkụ Onyenwe anyị dajụọ, ka o gosikwa gị obi ebere. Ọ ga-enwekwa ọmịiko nʼahụ gị, meekwa ka ị baa ụba nʼọnụọgụgụ, dịka o ji ịṅụ iyi kwee nna nna gị ha na nkwa.

18Onyenwe anyị Chineke gị ga-eme ihe ndị a ma ọ bụrụ na ị na-erubere ya isi, na-edebezukwa iwu ya niile, nke m na-enye gị taa, ma na-eme ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị Chineke gị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.