2ọ bụrụkwa na ihe ịrịbama ahụ maọbụ ihe ebube ahụ e kwuru maka ya emezuo, emesịa onye amụma ahụ na-asị, “Ka anyị gbaso chi ndị ọzọ dị iche, ka anyị feekwa ha,” bụ chi ndị ị na-amaghị,
3egela okwu onye amụma maọbụ ọrọ nrọ ahụ ntị. Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Chineke unu na-ele unu ule ịmata ma unu jikwa obi unu, na uche unu hụ ya nʼanya.
4Ọ bụ Onyenwe anyị bụ Chineke unu ka unu ga-eso, naanị ya ka unu ga-atụ egwu. Debenụ iwu ya niile na-erubekwara ya isi, na-ejere ya ozi, jidesiekwa ya ike.
5A ga-egbu onye amụma ahụ maọbụ onye ọrọ nrọ ahụ nke chọrọ iduhie unu, nʼihi na ọ chọrọ iweta nnupu isi megide Onyenwe anyị bụ Chineke unu, onye kpọpụtara unu site nʼala Ijipt, onye gbapụtara unu site nʼọnọdụ ịbụ ndị ohu. Ihe ọ chọrọ ime bụ iduhie gị, ka ị ghara ibi ụdị ndụ ahụ Onyenwe anyị Chineke gị chọrọ ka i bie. Ọnwụ ya ga-eme ka i wezuga ihe ọjọọ site nʼetiti gị.
6Ọ bụrụ na ezi enyi gị maọbụ nwanne gị nwoke maọbụ nwa gị nwoke maọbụ nwunye gị ị hụrụ nʼanya ejiri aghụghọ gwa gị okwu sị gị, “Bịa ka anyị gaa fee chi ndị ọzọ ofufe” (bụ chi ndị ị na-amaghị maọbụ nke nna gị ha na-amaghị,