Diuteronomi 14

Nʼọgwụgwụ afọ atọ ọbụla, ị ga-eweta otu ụzọ nʼụzọ iri nke ihe ubi gị, chịkọta ha nʼebe a ga-echebe ha nʼobodo gị,

Deuteronomy 14:28 (UKJV) At the end of three years you shall bring forth all the tithe of yours increase the same year, and shall lay it up within your gates:

26Were ọlaọcha ahụ zụọ ihe ọbụla ị chọrọ: ehi, na atụrụ, na mmanya, maọbụ mmanya siri ike na-aba nʼanya maọbụ ihe ọbụla ọzọ nke ị chọrọ. Mgbe ahụ, gị na ezinaụlọ gị ga-eri nri nʼihu Onyenwe anyị Chineke gị, ṅụrịakwa ọṅụ.

27Echefukwala ime ka ndị Livayị soro gị rie ihe ị kpatara, nʼihi na ha enweghị ihe nketa ọbụla, maọbụ ihe ubi dịka gị.

28Nʼọgwụgwụ afọ atọ ọbụla, ị ga-eweta otu ụzọ nʼụzọ iri nke ihe ubi gị, chịkọta ha nʼebe a ga-echebe ha nʼobodo gị,

29ka ndị Livayị, ndị na-enweghị ihe nketa nʼetiti gị, na ndị ọbịa, na ndị inyom di ha nwụrụ anwụ, na ụmụ mgbei niile nọ nʼobodo gị, bịa nʼebe ahụ were nri ha ga-eri, rijuokwa afọ. Nʼụzọ dị otu a, Onyenwe anyị Chineke gị ga-agọzi gị, gọziekwa ọrụ aka gị niile.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.