Diuteronomi 14

Nʼime ihe niile e kere eke, dị ndụ, biri na mmiri, unu nwere ike iri nke ọbụla nwere ntu na akpịrịkpa,

Deuteronomy 14:9 (UKJV) These all of you shall eat of all that are in the waters: all that have fins and scales shall all of you eat:

7Ma otu ọ dị, nʼetiti anụ ndị ahụ na-atagharị nri maọbụ ndị ụkwụ ha wara njakpa, ndị a ka unu na-agaghị eri, ịnyịnya kamel, na ewi maọbụ ewi nkume, na anụ ndị ọzọ yiri ha, ọ bụ ezie na ha na-atagharị ọnụ, ma ha enweghị ụkwụ wara njakpa. Ha bụ ihe na-adịghị ọcha nye unu.

8Ezi bụkwa anụ na-adịghị ọcha; ọ bụ ezie na o nwere ụkwụ wara njakpa, ma ọ dịghị atagharị nri. Unu agaghị emetụla ozu ha aka maọbụ rie anụ ha.

9Nʼime ihe niile e kere eke, dị ndụ, biri na mmiri, unu nwere ike iri nke ọbụla nwere ntu na akpịrịkpa,

10ma ihe ọbụla nke na-enweghị ntu na akpịrịkpa, unu erila ha, nʼihi na ha rụrụ arụ.

11Unu ga-eri nnụnụ ọbụla dị ọcha,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.