21Ma ọ bụrụ na nwa anụ ọbụla e buru ụzọ mụọ nwere nkwarụ, dịka ngwụrọ maọbụ ìsì maọbụ nkwarụ ọbụla nke jọrọ njọ, ị gaghị eji ya achụ aja nye Onyenwe anyị Chineke gị.
22Kama, ka ọ bụrụ ihe oriri nye ezinaụlọ gị nʼime ụlọ gị. Onye ọbụla, ma ndị dị ọcha ma onye rụrụ arụ nʼoge ahụ ga-eri ya, dịka onye ọbụla pụrụ iri anụ ele maọbụ anụ mgbada.
23Ma erila ọbara ya. Wụsa ya nʼala dịka mmiri.