Diuteronomi 18

ọ ga-eje ozi nʼaha Onyenwe anyị bụ Chineke ya dịka ụmụnna ya ndị Livayị na-eje ozi nʼihu Onyenwe anyị.

Deuteronomy 18:7 (UKJV) Then he shall minister in the name of the LORD his God, as all his brethren the Levites do, which stand there before the LORD.

5Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu ahọpụtala ebo Livayị na ụmụ ụmụ ha site nʼebo niile nke Izrel ka ha bụrụ ndị ga-eguzo jee ozi nʼihu Onyenwe anyị oge niile.

6Onye Livayị ọbụla si nʼebe o bi kwapụ gaa biri nʼobodo ọzọ nʼIzrel nwere ike ije nʼebe ịchụ aja Onyenwe anyị họpụtara,

7ọ ga-eje ozi nʼaha Onyenwe anyị bụ Chineke ya dịka ụmụnna ya ndị Livayị na-eje ozi nʼihu Onyenwe anyị.

8Ọ ga-esokwa keta oke a na-ekenye ndị Livayị bi nʼobodo ahụ, nʼagbanyeghị na ọ na-enweta ego site nʼorire e rere ihe onwunwe ezinaụlọ ya.

9Mgbe ị banyere nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị, amụtakwala ime omume arụ dịka ndị mba bi nʼala ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.