9nʼihi na i leziri anya gbasoo iwu ndị a m nyere gị taa ịhụ Onyenwe anyị Chineke gị nʼanya, na ije ije dịka ụzọ ya si dị, mgbe ahụ, i nwere ike họpụta obodo atọ ọzọ, nke ga-abụ obodo izere ndụ.
10Nʼụzọ dị otu a, ị ga-enwe ike gbochie ọnwụ ndị aka ha dị ọcha. Ọbara onye na-adịghị ihe o mere agaghị adịkwa gị nʼisi, nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị dịka ihe nketa.
11Ma ọ bụrụ na nwoke ọbụla echere onye ọ kpọrọ asị nʼụzọ, gbuo ya, mesịa gbara ọsọ gaa nʼime otu obodo ndị a,
12ndị okenye obodo ya ga-ezi ndị mmadụ ka ha gaa kpụta ya site nʼebe ahụ. Ha ga-ewerekwa ya nyefee nʼaka onye ga-abọrọ onye ahụ nwụrụ anwụ ọbọ, ka o gbuo ya.
13Emerela ya ebere. Ị ghaghị ikpochapụ site nʼIzrel ikpe ọmụma nke so iwufu ọbara ndị aka ha dị ọcha, ka ihe gaara gị nke ọma.