15Amala onye ọbụla ikpe mmehie nʼihi ama otu onye gbara. E kwesiri inwe ndị akaebe abụọ, maọbụ atọ tupu a maa mmadụ ikpe.
16Ọ bụrụ na onye ọbụla achọọ imegide onye ọzọ site nʼịgba ama ụgha,
17a ga-eduru mmadụ abụọ ahụ bịa nʼihu Onyenwe anyị na nʼihu ndị nchụaja na ndị ikpe na-arụ ọrụ nʼoge ahụ.
18Ndị ikpe ga-enyocha okwu ahụ nke ọma. Ọ bụrụ na a chọpụta na onye akaebe ahụ gbara ama ụgha,
19ọ ga-ata ahụhụ ahụ nwoke ahụ ọ gbagidere akaebe gaara ata. Nʼụzọ dị otu a, ị ga-ekpochapụ ndị ọjọọ site nʼetiti gị.