5Ọ bụrụ na mmadụ na ibe ya agaa nʼọhịa ịwa nkụ ma isi anyụike ya esite nʼosisi ya dapụ dagbuo nwoke ahụ so ya gaa ịwa nkụ, nwoke ahụ na-awa nkụ ga-agbala nʼime otu obodo ndị a ichebe ndụ ya.
6Ma ọ bụghị otu a, onye ahụ na-agba ụgwọ ọchụ ga-esite nʼọnụma juru ya obi chụọ nwoke ahụ ọsọ, chụkwute ya, gbuo ya ma ọ bụrụ na obodo mgbaba ahụ adịrị nʼebe dị anya, ọ bụ ezie na nwoke ahụ abụghị onye kwesiri ọnwụ, ebe ọ bụ na o siteghị nʼekworo gbuo onye o gburu.
7Ọ bụ nke a mere m ji nye unu iwu ka unu wepụtara onwe unu obodo mgbaba atọ.
8Ọ bụrụ na Onyenwe anyị Chineke gị emee ka oke ala gị saa mbara dịka ọ ṅụụrụ nna nna gị ha nʼiyi na ọ ga-eme, ọ bụrụkwa na o nye gị ala niile dịka o kwere na nkwa,
9nʼihi na i leziri anya gbasoo iwu ndị a m nyere gị taa ịhụ Onyenwe anyị Chineke gị nʼanya, na ije ije dịka ụzọ ya si dị, mgbe ahụ, i nwere ike họpụta obodo atọ ọzọ, nke ga-abụ obodo izere ndụ.