Diuteronomi 2

(Ndị biri nʼebe ahụ na mgbe gara aga bụ ndị Emim, agbụrụ ha gbara dimkpa dịkwa ọtụtụ nʼọnụọgụgụ. Ha toro ogologo dịka ndị Anak.

Deuteronomy 2:10 (UKJV) The Emims dwelt therein in times past, a people great, and many, and tall, as the Anakims;

8Ya mere, anyị sitere nʼala ụmụnna anyị bụ ụmụ Ịsọ, ndị bi na Sia gafee. Anyị hapụkwara ụzọ Araba nke si Elat na Eziọn Geba, tụgharịa gawa elu elu ụzọ ọzara Moab.

9Mgbe ahụ, Onyenwe anyị dọrọ anyị aka na ntị sị, “Unu esogbula maọbụ lụso ndị Moab ọgụ nʼihi na unu enweghị oke nʼala ha, nʼihi na enyela m ụmụ ụmụ Lọt ala Ar ka ọ bụrụ ihe nketa nke ha.”

10(Ndị biri nʼebe ahụ na mgbe gara aga bụ ndị Emim, agbụrụ ha gbara dimkpa dịkwa ọtụtụ nʼọnụọgụgụ. Ha toro ogologo dịka ndị Anak.

11A na-eche na ha bụ ndị Refaim, dịka ndị Anak, ma ndị Moab na-akpọ ha ndị Emim.

12Ma mgbe gara aga ọ bụ ndị Hor bi na Sia, ma ndị Edọm, ụmụ Ịsọ, chụpụrụ ha. Ha bibiri ndị Hor bichikwaa ala ha, dịka ụmụ Izrel si bichie nʼala ahụ Onyenwe anyị nyere ha dịka ihe nketa.)

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.