29dịka ụmụ Ịsọ, bụ ndị bi na Sia, nakwa ndị Moab bi nʼobodo Ar meere anyị, ruo mgbe anyị gafere Jọdan banye nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke anyị na-enye anyị.”
30Ma Saịhọn, eze Heshbọn, ekweghị ka anyị si nʼala ya gafee. Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu mere ka mmụọ ya sie ike, meekwa ka o mesie obi ya ike, ka o si otu a nyefee ya nʼaka unu dịka ọ mere ugbu a.
31Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara m sị, “Lee, amalitela m iwere Saịhọn na obodo a nyefee unu nʼaka. Ngwanụ, malitenụ ibuso ya agha! Merienụ ya, nwetakwanụ ala ya.”
32Mgbe Saịhọn na ndị agha ya niile pụtara izute anyị nʼagha nʼebe a na-akpọ Jehaz,
33Onyenwe anyị Chineke anyị nyefere ya nʼaka anyị. Anyị gburu ya, gbukwaa ụmụ ya ndị ikom niile, na ndị agha ya niile.