17Ị ghaghị ịla obodo ndị a nʼiyi: obodo ndị Het na nke ndị Amọrait, nke ndị Kenan na nke ndị Periz, nke ndị Hiv na nke ndị Jebus, dịka Onyenwe anyị Chineke gị nyere gị nʼiwu.
18Ma ọ bụghị otu a, ha ga-akụziri gị ime ihe ndị ahụ niile rụrụ arụ ha na-eme mgbe ha na-efe chi ha dị iche iche, mee ka i mehie megide Onyenwe anyị Chineke gị.
19Mgbe ị nọchibidoro obodo ọbụla ogologo oge, na-ebu agha megide ya maka iwere ya, ebibila osisi na-amị mkpụrụ dị nʼime ya site nʼiji anyụike gbutuo ha. Nʼihi na i nwere ike rie mkpụrụ osisi ha, egbutula ha. Osisi dị nʼọhịa ha ọ bụ ndị mmadụ, na ị ga-anọchibido ha?
20Naanị osisi na-adịghị amị mkpụrụ ka ị ga-egbutu, nke a na-adịghị eri mkpụrụ ya eri. Jiri ha meere onwe gị ngwa ọgụ, dịka ubibi, na nkwasa, na ihe unu ji etitu mgbidi obodo ahụ.