19Ha ga-emekwa ya ka ọ kwụọ nna nwaagbọghọ ahụ narị shekel ọlaọcha, nʼihi na o boro nwaagbọghọ Izrel na-amaghị nwoke ebubo ụgha. Nwaagbọghọ ahụ ga-anọgide bụrụ nwunye nwoke ahụ. Nwoke ahụ agaghị achụpụkwa ya ụbọchị ndụ ya niile.
20Ma ọ bụrụ na ebubo nwoke ahụ bụ eziokwu, na achọpụtaghị ihe gosiri na nwaagbọghọ ahụ amaghị nwoke.
21A ga-eduru nwaagbọghọ ahụ pụta nʼọnụ ụzọ ụlọ nna ya, nʼebe ahụ ka ndị ikom obodo ya ga-anọ were nkume tugbuo ya. Nʼihi na o mere ihe ihere jọgburu onwe ya nʼIzrel, site nʼibi ndụ akwụna mgbe ọ ka nọ nʼụlọ nne ya na nna ya. Ị ghaghị ikpochapụ ihe ọjọọ ahụ site nʼetiti unu.
22Ọ bụrụ na e jide nwoke ebe ya na nwunye onye ọzọ dina, ma nwoke ahụ dinara ya ma nwanyị ahụ o dinara aghaghị ịnwụ. Nʼụzọ dị otu a, ị ga-ekpochapụ ihe ọjọọ a site nʼIzrel.
23Ma ọ bụrụ na nwaagbọghọ na-amaghị nwoke a na-alụ alụ na nwoke ọzọ edinakọọ nʼime obodo,