2Ọ bụrụ na emesịa, nwoke ọzọ alụọ ya,
3ma nwoke ahụ ekpebiekwa ịgbara ya akwụkwọ achọkwaghị m, maọbụ na nwoke a mesịrị nwụọ,
4nwoke mbụ ahụ lụrụ nwanyị ahụ agaghị alụ ya ọzọ, nʼihi na nwanyị a abụrụla onye rụrụ arụ nye nwoke ahụ. Ọ bụkwa arụ nʼanya Onyenwe anyị ma di ya nke mbụ lụọ ya ọzọ. Ihe dị otu a ga-eweta ihe ọjọọ nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke na-enye gị dịka ihe nketa.
5Nwoke ọbụla lụrụ nwunye ọhụrụ agaghị apụ soro ndị agha, maọbụ soro rụọ ọrụ ọzọ pụrụ iche, otu afọ ka ọ ga-enwere onwe ya ịnọ nʼụlọ ya, ya na nwunye ya, ime onwe ha obi ụtọ.
6Mmadụ agaghị ewere nkume ịkwọ nri dịka ihe ebe, nʼihi na ọ bụ ihe onye nwe ya ji achọta nri ụbọchị ya.