Diuteronomi 26

Ọ kpọbatara anyị nʼebe a, nye anyị ala a, ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.

Deuteronomy 26:9 (UKJV) And he has brought us into this place, and has given us this land, even a land that flows with milk and honey.

7Mgbe ahụ, anyị tikuru Onyenwe anyị Chineke nna nna anyị. Onyenwe anyị nụrụ olu anyị, hụkwa mmegbu a na-emegbu anyị, na ndọgbu anyị na-adọgbu onwe anyị nʼọrụ, na ọnọdụ ọjọọ anyị.

8Onyenwe anyị ji aka dị ike na ogwe aka o setịrị eseti, nʼọtụtụ ihe oke egwu na ọrụ ịrịbama, na ihe ebube, si nʼIjipt kpọpụta anyị.

9Ọ kpọbatara anyị nʼebe a, nye anyị ala a, ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.

10Ya mere, ugbu a, Onyenwe anyị, lee, ewebatala m mkpụrụ mbụ sitere nʼala i nyere m.” Dọba nkata ahụ nʼihu Onyenwe anyị Chineke gị, kpọọkwa isiala nye ya nʼebe ahụ.

11Mgbe ahụ, gị na ndị Livayị, na ndị mbịarambịa bi nʼetiti unu, ga-aṅụrị ọṅụ nʼihe ọma niile Onyenwe anyị Chineke gị nyere gị na ezinaụlọ gị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.