12Mgbe unu gafere Jọdan, ebo ndị a: Simiọn, na Livayị na Juda na Isaka na Josef na Benjamin, ga-eguzo nʼelu ugwu Gerizim gọzie ụmụ Izrel
13Agbụrụ Ruben, Gad, Asha, Zebụlọn, Dan na Naftalị ga-eguzo nʼelu ugwu Ebal kwupụta ọbụbụ ọnụ.
14Ndị Livayị ga-eji olu dị elu gụpụta ya nye ụmụ Izrel niile,
15“Onye a bụrụ ọnụ ka mmadụ ahụ bụ nke na-apị arụsị maọbụ oyiyi ọbụla, akaọrụ onye ǹka, nke bụ ihe arụ nʼanya Onyenwe anyị, ma na-eguzobe ya na nzuzo.” Ndị mmadụ niile ga-aza sị, “Amen.”
16“Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ, nke na-elelị nna ya na nne ya.” Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.”