23“Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ, nke ya na nne nwunye ya na-edina.” Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.”
24“Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ, nke na-etigbu mmadụ ibe ya na nzuzo.” Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.”
25“Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ, nke na-anara ngarị maka itigbu onye na-emeghị ihe ọjọọ ọbụla.” Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.”
26“Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ, nke na-adịghị eme ka iwu ndị a guzosie ike site na-edebeghị ha.” Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.”