7Chụọ aja udo nʼebe ahụ, rie ha, ma ṅụrịakwa ọṅụ nʼihu Onyenwe anyị Chineke gị.
8Depụta iwu ndị a nke ọma, nʼelu nkume ndị ahụ i guzobere.”
9Mgbe ahụ, Mosis na ndị nchụaja, bụ ndị Livayị, gwakwara ndị Izrel niile okwu sị, “Nọọnụ jii, gị Izrel, gekwaa ntị! Taa, ị ghọọla ndị nke Onyenwe anyị Chineke unu.
10Nʼihi ya debe iwu niile Onyenwe anyị Chineke gị na ụkpụrụ niile ndị m nyere gị taa.”
11Nʼotu ụbọchị ahụ ka Mosis nyere ha iwu sị,