1Ọ bụrụ na i debezuo ma gbasookwa iwu ndị a niile Onyenwe anyị Chineke gị sitere nʼaka m na-enye gị taa, Onyenwe anyị Chineke gị ga-eme ka ị ghọọ mba kachasị mba niile nʼụwa elu.
2Ngọzị ndị a niile ga-abịakwasị gị, zuo gị ahụ, ma ọ bụrụ na i rubere Onyenwe anyị Chineke gị isi.
3Onye a gọziri agọzi ka ị ga-abụ nʼobodo, bụrụkwa onye a gọziri agọzi nʼala ubi.