8Onyenwe anyị ga-ezipụ ngọzị ya ka ọ dịkwasị nʼelu ọba gị na nʼelu ihe ọbụla i tinyere aka gị. Onyenwe anyị Chineke gị ga-agọzi gị nʼala ahụ ọ na-enye gị.
9Onyenwe anyị ga-eme ka i guzosie ike dịka ndị nsọ ya, dịka o sitere nʼịṅụ iyi kwee nkwa ime ma ọ bụrụ na i debe iwu Onyenwe anyị Chineke gị, ma jee ije nʼụzọ ya niile.
10Mgbe ahụ, ndị niile nọ nʼụwa ga-ahụta na ọ bụ aha Onyenwe anyị ka a kpọkwasịrị gị. Ha ga-atụkwa gị egwu.
11Onyenwe anyị ga-eme ka ị babiga ụba oke na mkpụrụ nke afọ gị, na mkpụrụ nke anụ ụlọ gị, na mkpụrụ nke ihe ubi gị, nʼala ahụ ọ ṅụrụ nʼiyi nye nna nna gị na ọ ga-enye gị.
12Onyenwe anyị ga-emeghepụ eluigwe ebe ụlọakụ ya dị, zidata mmiri nʼala gị nʼoge ya, ma gọzie akaọrụ gị niile. Ị ga-agbazinye ọtụtụ mba ihe, ma gị onwe gị agaghị esite nʼaka onye ọbụla gbaziri ihe ọbụla.