11Onyenwe anyị ga-eme ka ị babiga ụba oke na mkpụrụ nke afọ gị, na mkpụrụ nke anụ ụlọ gị, na mkpụrụ nke ihe ubi gị, nʼala ahụ ọ ṅụrụ nʼiyi nye nna nna gị na ọ ga-enye gị.
12Onyenwe anyị ga-emeghepụ eluigwe ebe ụlọakụ ya dị, zidata mmiri nʼala gị nʼoge ya, ma gọzie akaọrụ gị niile. Ị ga-agbazinye ọtụtụ mba ihe, ma gị onwe gị agaghị esite nʼaka onye ọbụla gbaziri ihe ọbụla.
13Onyenwe anyị ga-eme ka ị bụrụ isi, ọ bụghị ọdụdụ. Ọ bụrụ na ị ṅaa ntị nʼiwu ndị a Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị taa, lezie anya ịgbaso ha, ị ga-anọgide nʼelu, ị gaghị anọ nʼokpuru.
14Ewezugala onwe gị site nʼiwu niile ndị a m na-enye gị taa, maọbụ gaa nʼaka nri maọbụ nʼaka ekpe, ịgbaso chi ndị ọzọ na ife ha ofufe.
15Ma otu ọ dị, ọ bụrụ na ị jụ irubere Onyenwe anyị Chineke gị isi, jụkwa ilezi anya, gbasoo iwu ya na ụkpụrụ ya niile, nke m na-enye gị taa, ọbụbụ ọnụ ndị a ga-adakwasị gị.