25Ọsịsa ya ga-abụ, “Ọ bụ nʼihi na ndị a hapụrụ idebe ọgbụgba ndụ ha na Onyenwe anyị, Chineke nke nna nna ha gbara, ọgbụgba ndụ ha na ya gbara mgbe o mere ka ha site nʼIjipt pụta.
26Nʼihi na ha fere chi ndị ọzọ ofufe, kpọọkwa isiala nye ha, bụ chi ndị nke ha na-amaghị, chi ndị nke ọ na-enyeghị ha.
27Ọ bụ ya mere iwe Onyenwe anyị ji dị ọkụ megide ala a, meekwa ka o zidata nʼisi ha ọbụbụ ọnụ niile e dere nʼime akwụkwọ a.
28Nʼoke iwe ya na ọnụma ya ka Onyenwe anyị ji hopu ha site nʼala ha, werekwa ha tụba nʼala ọzọ, dịka ọ dị ugbu a.”
29Ihe niile e zoro ezo dịrị Onyenwe anyị Chineke anyị, ma ihe ndị ahụ niile e kpughere ekpughe dịịrị anyị, dịkwara ụmụ anyị ruo mgbe ebighị ebi, ka anyị nwee ike ịgbaso na imezu okwu niile nke iwu a.