22Atụla ha egwu, nʼihi Onyenwe anyị Chineke gị ga-alụrụ gị ọgụ.”
23Nʼoge ahụ, arịrịọ m Onyenwe anyị arịrịọ sị ya,
24“Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ị malitela igosi mụ bụ ohu gị ịdị ukwuu gị na ike gị. O nweghị chi ọzọ dị nʼeluigwe maọbụ nʼụwa pụrụ ịrụ ọrụ ebube niile ị rụrụ.
25Kwere ka m gafee hụ ala ọma ahụ dị nʼofe ọzọ nke Jọdan, ala ugwu ugwu ahụ mara mma, na Lebanọn.”
26Ma nʼihi unu, Onyenwe anyị wesoro m iwe jụ ige m ntị! Onyenwe anyị gwara m okwu sị m, “O zuola! Agwakwala m ihe ọbụla banyere okwu a.