1Mgbe Mosis gwachara ụmụ Izrel okwu ndị a niile,
2ọ gwakwara ha okwu ọzọ sị, “Ugbu a, agbaala m otu narị afọ na iri afọ abụọ! Enwekwaghị m ike idu unu, nʼihi na Onyenwe anyị agwala m sị, Ị gaghị agafe osimiri Jọdan.
3Onyenwe anyị Chineke gị nʼonwe ya ga-ebu gị ụzọ gabiga osimiri a. Ọ ga-ebibi mba niile ndị a nʼihu gị. Ị ga-enwetakwa ala ha. Joshua ga-edu gị gabiga osimiri a, dịka Onyenwe anyị kwuru.
4Onyenwe anyị ga-emekwa ha ihe o mere Saịhọn na Ọg, bụ eze ndị Amọrait, ndị o kpochapụrụ ha na ala ha.
5Onyenwe anyị ga-enyefe ndị bi nʼebe ahụ nʼaka unu, unu ga-ekpochapụkwa ha dịka m nyere unu nʼiwu.