5Onyenwe anyị ga-enyefe ndị bi nʼebe ahụ nʼaka unu, unu ga-ekpochapụkwa ha dịka m nyere unu nʼiwu.
6Dịnụ ike! Nweenụ obi ike! Unu atụla ha egwu! Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu ga-anọnyere unu. Ọ gaghị agbakụta unu azụ, ọ gakwaghị ahapụ unu.”
7Mgbe ahụ, Mosis kpọrọ Joshua, gwa ya okwu nʼihu ụmụ Izrel, sị ya, “Dị ike! Nwee obi ike! Nʼihi na ọ bụ gị ga-edu ndị a baa nʼala ahụ Onyenwe anyị ṅụrụ iyi inye nna nna ha, ị ga-emekwa ka ha keta ala a dịka ihe nketa ha.
8Onyenwe anyị nʼonwe ya ga-eburu gị ụzọ, ọ ga-anọnyekwara gị, ọ gaghị ahapụ gị maọbụ gbakụta gị azụ. Atụla egwu, adala mba.”
9Mgbe ahụ, Mosis depụtara iwu ndị ahụ niile nʼakwụkwọ, were ya nye ndị nchụaja, ụmụ Livayị, ndị na-ebu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ. Mosis nyekwara ndị okenye Izrel akwụkwọ a e dere iwu niile.